2023: Njem

From Wikimania
Jump to navigation Jump to search
This page is a translated version of the page 2023:Travel and the translation is 100% complete.



16–19 August 2023, Singapore and Online


Ebe ọgbakọ

A ga-eme mmemme a na Suntec Singapore Convention and Exhibition Center na ogbe ndịda Singapore. Ọ na-agụnye tupu ogbako na isi ogbako
1° 17′ 36.96″ N, 103° 51′ 18″ E.

Ọgbakọ mmechi anyị ga-eme na Ogige ndị dị n'akụkụ mmiri'.

A ga-ekwuputa ebe a ga-enwe ọgbakọ mmecha n'oge na-adịghị anya!

Mbata na Singapore

Biko hụ ngalaba e-Visas' maka ozi ndị ọzọ gbasara ntinye nke Singapore.

Ọgwụ nke onwe

Biko jiri ọrụ ịntanetị lelee ọkwa ọgwụ ọ bụla i nwere ike iweta. Ụfọdụ ọgwụ nwere ike ịchọ ka i tinye akwụkwọ maka nkwado ma ọ dịkarịa ala ụbọchị 10 tupu ịbata, ndị ọzọ nwere ike machibido. hụ: Ngwá ọrụ nlele ọgwụ

Lelee ọgwụ ọ bụla site na aha ezuru ezu nwee / aha onwe ya bụ Paracetamol karịa aha azụmaahịa ya Panadol/Panamax, enwere ike ịjụ gị maka capsule ma ọ bụ tebụl 500mg maka ihe atụ a. Ka ị na-agafe ọgwụ ọ bụla ibe ahụ na-edobe usoro ọchụchọ wee mepụta PDF, i nwere ike idobe ndepụta ahụ nke ọ bụla na nke akwadoro na nke ịchọrọ nkwado.

Ọgwụ chọrọ nkwado pụrụ iche

Ọ bụrụ na i nwere ọgwụ chọrọ nkwado pụrụ iche ị ga-aga na ibe a https://www.hsa.gov.sg/personal-medication/apply-approval ebe a ị dejupụtara ụdịdị dị iche iche chọrọ nkọwa njem gị, ọ na-arịọ maka nọmba paspọtụ, nkọwa mbata, na ogologo oge ịnọ. Ọ ga-ewepụta ngwa PDF, achọrọ ka inye foto nke ma ọ bụ edemede sitere na dọkịta gị ma ọ bụ akara ndị na-ere ọgwụ / kemist nke na-egosi usoro onunu na aha gị.

Ibe ahụ na-arịọ gị ka i kwe ka ụbọchị 10 maka nzaghachi biko mee nke a ihe dị ka mkpụrụ ụbọchị 14-21 tupu ọpụpụ iji kwe ka nhazi, ngwa m were ụbọchị 3. Ọ bụrụ na ajụrụ ya gwa dọkịta gị okwu wee hụ ma o nwere ụzọ ọzọ ha ga-anabata.

Mgbe akwadoro ya, ị ga-enweta ozi-e nke ị ga-ewetarịrị mgbe ị na-agafe ndị kọstọm na Singapore.

Ihe gbasara Singapore

Wikivoyage nwere nkọwa zuru ezu ndụmọdụ njem gbasara Singapore. Maka nghọta miri emi gbasara obodo a, i nwere ike leba anya na nke a edemede na Wikipedia.

Akụkọ ngwa ngwa gbasara Singapore
Demonym Singaporean
Mpaghara oge UTC+8 Tugharia elekere 9 nke ụtụtụ Singapore ka ọ bụrụ mpaghara oge gị
Ọwụwa anyanwụ/ ọdịda anyanwụ 07:00 / 19:15 (n'oge ogbako)
Asụsụ ndị gọọmentị
Okpukpe ndị na-achị achị
Ego Dollar (SGD / $)

US$ 1.00 = SGD$ 1.35

ka nke 12 Disemba 2022 (lelee ọnụego mgbanwe kacha ọhụrụ)

Ihu igwe
Ụdị nkwụnye: Ụdị G (British)

Isi: 230V / 50Hz

Usoro ịkwọ ụgbọala Ịkwọ ụgbọala n'aka ekpe
Koodu obodo +65
Ọdụ Ụgbọ elu
ỌnụọgụgụvNdị mmadụ 5,637,000 (atụmatụ 2022)

Njupụta: 7,804/km2 (2022)

Mgbakọta mpaghara ala 733.1 km2
Ịkpọ ụgbọala/ịgbakọta ụgbọala Gojek, Grab, Ryde, Tada, Zig
Ekwentị mkpanaaka / ịntanetị
  • Singtel
  • Starhub
  • M1
  • Simba (bụburu TPG)
Akara ọkpụkpọ oku mberede
  • 995 (ụgbọ ihe mberede na ọkụ mberede)
  • 999 (akara ihe mberede ndị uwe ojii)
  • 1777 (ụgbọ ala na-abụghị ihe mberede)
  • 71999 (nzipụ ozi mberede ndị uwe ojii)