2023: Ndebanye

From Wikimania
This page is a translated version of the page 2023:Registration and the translation is 75% complete.
Outdated translations are marked like this.


16–19 August 2023, Singapore and Online
Diversity. Collaboration. Future.

Amalitela idebanye ahà maka Wikimania nke afọ̀ a bụ 2023. Ụbọchị ikpeazụ i nwere idebanye ahà maka ịga mbà Singapore bụ ụbọchị nke iri na isii n'ọnwa Julaị, mana ọ bụrụ na ị chórọ ịnọ n'Ịntanetị esonye, ị ga-edebanye ahà mgbe ọbụla masịrị gị.


Biko, gaa na registration privacy statement ka ị gụọ banyere ichekwaba ihe i dere banyere onwe gị.

Ịnọ n'Intanetị esonye na Wikimania, ya na idebanye ahà n'onwe ya, bụ n'ebe a eventyay—an open source virtual and hybrid event platform

I ga-enweta akàrà maka idebanye ahà gị na ntụziaka ihe ndị i ga-eme, ma ọ bụrụ na Wikimedia Foundation maọbụ òtù kwụnyere na Wikimedia ga-akwụrụ gị ụgwọ maka isonye n'ọgbakọ a.

I denye ahà maka ịga mbà Singapore, a ga-enye gị nri ehihie n'ọgbakọ ahụ̀ site n'ụbọchị nke iri na isii ruo n'ụbọchị nke iri na itolu n'ọnwa Ọgọstụ; a ga-enye gị nri anyasị n'ụbọchị nke iri na isii na n'ụbọchị nke iri na itolu. N'ebe ahụ̀ a ga-enwe ọgbakọ, a ga-edebe WaịFaị maka ikonye n'Intanetị, debekwa ihe ị ga-akwụnye kọmputa maọbụ ekwentị gị gị n'ọkụ eletiriki.