Afọ puku abụọ na iri abụọ na atọ : Ihe mmemme/webata
16–19 August 2023, Singapore and Online
Diversity. Collaboration. Future.
Isiokwu
Isiokwu maka Wikimania 2023 bụ Ọdidịiche, Imekọ ihe ọnụ, Ọdịnihu' E bu n'obi ka ọ bụrụ nbibi a ga eji hụkọrịta ihe mmemme niile. Akwụwọ arụmarụ gị kwesịrị inwe ihe akọrọngwa jikọrọ ya opekata mpe otu n'ime ndị a. Ọtụtụ n'ime ihe anyị na-eme kwa ụbọchị na Wikimedia - n'ọrụ ma ọ bụ n'ime obodo - na-egosipụtalarị isiokwu a na nke ukwuu n'ụzọ kwekọrọ n'otú ESEAP mpaghara imekọ ihe na-esi achọpụta ma na-arụ ọrụ.
- Ọdịdịiche. Wikimania ga-abụ ohere igosi otu mpaghara na isiokwu dị ka ESEAP ihe ịmaatụ nke nsonye: ndị ọrụ afọ ofufo dị iche iche, ndị mmadụ n'otu n'otu, na ndị mmekọ, na ọkwa dị iche iche nke mmepe na site na ndị iche iche. Omenala jikọtara ọnụ na imekọ ihe ọnụ n'ụzọ ziri ezi.
- Mmekọrịta ihe ọnụ.' Dị ka ihe nkesa, zuru ụwa ọnụ, Wikimania ga-abụ ụzọ isi mụta ihe site na mmekọrita mmadụ na ibe ya ma kesaa ihe ọmụma dị ka atụmatụ obodo, iji ngwá ọrụ eme ihe, ịhazi ihe omume, ọchịchị, mgbasa ozi n'ịntanetị na edit-a-thon, idozi Nsogbu ndị metụtara Wiki, yana ndị ọzọ
- Odinihu. Wikimania 2023 ga abụ uru mpụtara ìhè nye ọtụtụ ndị Wikimedian dị ka ọgbakọ ikpa nkata gbasara ntinye n'ọrụ 2030 Wikimedia Movement Strategy
(#Wikimedia2030), na ihe dị mkpa ndị ọzọ na-akpata ọgbakọ anyị ugbu a na ọdịnihu,site na nkà na ụzụ ruo na iwu na gburugburu ụwa.
Usoro
Iji mee ka nnadata akwụkwọ mmemme dị mfe ịhazi ma nyochaa, site n'enyemaka nke kọmitii ngalaba mmemme nke ndị ọrụ afọ ofufo, anyị atụpụtala usoro egwu mmemme iri na otu. Biko hụ n'okpuru maka ozi ndị ọzọ gbasara edemede na ngalaba ha. Chee echiche banyere nke kacha mma dabara echiche mmemme gị. Ọ bụrụ na ị chere nrubeisi gị na-emetụta ihe karịrị otu egwu, ị nwere ike ịkọwa egwu nke abụọ n'ụdị ntinye.
Usoro mmemme | Nkọwa | Ngalaba ụdị/ụfọdụ isiokwu atụpụtara |
---|---|---|
Atụmatụ ndị obodo | Usoro a nabatara ndị mmekọ na obodo dị iche iche iji gosipụta mgbasa ozi mmepe ọdịnaya ha na mmemme dị iche iche. | ■ Ọnọdụ mgbasa ozi dị iche iche
■ ọrụ Editathons |
Mmụta | Ebe a n'egosi ohere e wepụtara maka nchepụta na ihe dị iche iche dị na agụmakwụkwọ na ihe banyere ụlọ akwụkwọ agụmakwụkwọ. | ■ Wikipidia n'ime ụlọ akwụkwọ
■ Mmekọrịta dị n'etiti ụlọ mmụta agụakwụkwọ ma ọ bụ otú ndị nkuzi. |
Ịha nhatanha, nsonye, na ahụike obodo | Egwu a na-enye ohere iji kparịta nhatanha, nsonye, na ịbụ ihe dị ka ụzọ isi melite ahụike obodo. | ■ Mkparịta ụka etiti dị iche iche ■ Ịha nhatanha, nsonye na ihe onwunwe ■ Amamihe nhatanha ■ Inweta Ihu dị mfe nke onye ọrụ ■ Asụsụ dị iche iche (na ntụgharị asụsụ) ■ Ọdịiche nwoke na nwanyị na isiokwu ndị ọzọ dị iche iche ■ Ihe mgbochi adreesị IP dị na mba nwere akụrụngwa nwere oke/kekọrịtara ■ Usoro ụkpụrụ omume nke Wikimedia Universal Code of Conduct (UCoC) ■ Nchekwa nke ndị enyemaka afọ ofufo |
Mpaghara ESEAP (East, South East Asia, na Pacific). | Ndepụta nke a bụ iji gosipụta atụmatụ sitere n'aka ndị mmekọ, obodo na ndị nyere aka n'ịkwalite ọdịnaya ma ọ bụ nchegbu metụtara East, South East Asia na mpaghara Pacific. | ■ Mmekọrịta ọtụtụ omenala na mba ESEAP ■ Mmepe obodo ■ Mmepe ikike n'ọrụ Wikimedia nke obere na asụsụ ndị nke na-etolite |
GLAM, Nketa, na Omenala | Ndepụta nke a na-enye ohere maka atụmatụ na mmemme na ihe nketa na nchekwa omenala, imekọ ihe ọnụ na ụlọ ọrụ omenala gụnyere ebe ngosi, ọba akwụkwọ, ebe nchekwa na ebe ngosi ihe mgbe ochie. | ■ Atụmatụ nke dijitalụ ■ Mmepee nkwado ohere ■ Na-arụ ọrụ na obodo ndị amaala |
Ọchịchị | Ndepụta nke a na-akwado mkparita ụka obodo lekwasịrị anya na ọchịchị, nhazi na ndozigharị, atụmatụ ndị bụ isi sitere na Strategy Movement. | ■ Movement Charter ■ Ebe nhiwe nke Mpaghara na nke Isi okwu ■ Ọrụ na ibu ọrụ na mmegharị ■ Usoro ime mkpebi ■ Wikimedia Global Council ■ Ọchịchị kpọmkwem nke nchịkwa (ọrụ, obodo, ndị mmekọ) |
Iwu, nkwado, na ihe ize ndụ | Ndepụta nke a gụnyere isiokwu mkparịta ụka guzosiri ike, dị ka ikike nwebisiinka na nnweta dijitalụ, yana okwu ọhụrụ pụtara, dị ka nrịba ama na-agbasa ozi na-ezighi ezi n'ụwa, yana amụma ọha na ikike mmadụ. | ■ Mgbochi Wikipedia na mba ụfọdụ ■ Ozi na-ezighi ezi ■ Nwebisiinka ■ Ihe iyi egwu iwu, arịrịọ nbudata ■ Mmekọrịta gọọmentị ■ Mgbanwe nwebiisinka (Nnwere onwe nke Panorama, ikikere efu, wdg) ■ Ịnweta dijitalụ ■ Nkwado gburugburu ebe obibi na nsogbu ihu igwe |
Mmepee data | Ndepụta nke a na-enye ohere maka atụmatụ obodo na iji data na ijikwa ya, na-ejikọta ọrụ Wikimedia dị iche iche ọnụ na karịa | ■ Data ndekọ ọnụ ọgụgụ nke ọha na-enweta ■ Iji/jikwa data ọzọ ■ Mmepee data na nghọta ■ Njikọ data mpaghara, data mmekọrịta akụ na ụba, data igwe mmadụ ■ Wikidata ma ọ bụ Structured Data na Commons |
Nnyocha, Sayensị, na Ọgwụ | Ndepụta nke a na-anabata ọrụ nyocha na isiokwu metụtara Wikimedia na isiokwu Wikimania. Ọ bụkwa oghere iji kparịta atụmatụ ọdịnaya dị iche iche na ngalaba sayensị, okike na ọgwụ. | ■ Ọmụmụ gburugburu ebe obibi na nsogbu ihu igwe
■ Ọmụmụ ihe gbasara ụkpụrụ omume n'ịnye ọdịnaya |
Nkà na ụzụ | Ndepụta kpochapụwo nke a raara nye iji kparịta ngwaahịa na teknụzụ niile na mmegharị Wikimedia. | ■ Ngwaahịa na atụmatụ kacha ọhụrụ ■ Ngosipụta ngwaọrụ ma ọ bụ nkuzi ■ Ngwá ọrụ na mmepe ma ọ bụ ule ogo ■ Nkà na ụzụ ọhụrụ |
Echiche ọhịa | Ụzọ mepere emepe nke ga-eme n'ọdịnihu maka ndị Wikimedians iji kparịta echiche gbasara agbasa na amụma nke ọdịnihu...maka ọ dị mma ma ọ bụ ihe ọjọọ. | ■ Ọnọdụ dị nso ma ọ bụ n'ọdịnihu dị anya ■ Ọnọdụ Black Mirror ■ Iwu ụsoro nke iji ìgwè amu ihe na oké mmụta nke adigboroja. ■ Nweghara nke chatibot!!! |
nsunye ndị dị iche iche
A ga enwe ọtụtụ usoro, nke gụnyere nkụzi ihe, ọgbara ngọsipụta ihe, I kwurịkota ụka, tinyere nkuzi ihe di iche iche nke dabere na nkwalite ihe eji akọ n' uche eme. A ga enwe kwa ụfọdụ oge nke okwu nhazi na mkparịta ụka nke sarasara. Anyị mepekwara nye ihe mmemme nke mbụ ma tinyere nke ọhụrụ, echiche nke gunyere mgbakwunye nke yiri nkea.
Ngwakọ, Ihe omume satịlaịtị, ihe nkiri onyonyo nke achọrọ
Ndị otu Movement nwere ike iche maka ịhazi mmemme nkiri na ihe omume ndị ọzọ dịpụrụ adịpụ na ị wepụta ohere nke ijikọ ndụ na Singapore ma nye kwa ya ụbọchị. Ọ bụghị onye ọ bụla nọ n'ime ogbe nwere ike Ị ga njem ma ọ bụ chọọ ka ya na ndị Wikimidia ndị ọzọ nnọọkọọ. Gị na ndị ọrụ ibe gị nwere ike hazie mmemme satịlaịtị n'otu ụbọchị n'oge Wikimania. Maka ndị mmekọ Wikimidia, enwere ike ịhazi mmemme satịlaịtị wee kwado ya dịka akụkụ nke Ego Nkwado Ọha. Ọbụna ma ọ bụrụ na etinyeghị ya na mbụ dị ka atụmatụ, ịkwaga ego na mmefu ego gị nwere ike ịme ihe omume. Chọta ihe ndị ọzọ''''''''''''''''' ma biko jiri ibe okwu ya kparịta echiche tupu oge eruo.
Ajụjụ?
Anyị akwadola ihu Ajụjụ Ana Ajukari(AAA) maka gi. Ọ bụrụ n'enwere ajụjụ ndị ana-ajụ ndị n'anoghi na AAA, ị nwere ike ị zute ya site na ozi leta email Kọmitii mmemme nke ngalaba at: wikimaniawikimedia.org ma ọ bụ itinye ajụjụ gịihu enyemaka.